Ecclesiastes 5

Kwụghachi nkwa ị kwere Chineke

1Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.

2Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu
maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị,
maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu. a
Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe
ma naanị nʼụwa ka ị nọ,
nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.
3Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,
otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.
4Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke. 5Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya. 6Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị? 7Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.

Akụnụba enweghị isi

8Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha. 9Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.

10Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.
Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.
Nke a bụkwa ihe efu.

11Akụ na-abawanye,
ndị na-eri ya na-abawanyekwa.
Olee uru ha bara nye onyenwe ha
karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?

12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,
ma oke iriju afọ onye ọgaranya
anaghị ekwe ya rahụ ụra.
13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,

mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,
14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi
nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,
o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.
15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,
otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.
O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile
ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.
16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.

Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.
Gịnị bụ uru ya,
mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?
17Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,
site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.
18Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya. 19Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 20Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.

Copyright information for IboBIU